1 Ndị Eze 9:1
1 Kings 9:1 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Mgbe Solomọn rụchara ụlọnsọ ukwu Onyenwe anyị, na ụlọeze, rụzukwaa ihe niile bụ nke o bu nʼobi ime,
1 Kings 9:1 in English
1 Kings 9:1 · Berean Standard Bible
Now when Solomon had finished building the house of the LORD and the royal palace, and had achieved all that he had desired to do,
Context
1Mgbe Solomọn rụchara ụlọnsọ ukwu Onyenwe anyị, na ụlọeze, rụzukwaa ihe niile bụ nke o bu nʼobi ime, 2Onyenwe anyị mere ka ọ hụ ya anya nke ugboro abụọ dịka o mere ka ọ hụ ya anya na Gibiọn.* 3Onyenwe anyị sịrị ya,
“Anụla m ekpere gị, na arịrịọ gị, nke ị rịọrọ nʼihu m. Edoola m ụlọnsọ a nke i wuru nsọ, site nʼitinye Aha m nʼebe ahụ ruo mgbe ebighị ebi. Anya m na obi m abụọ ga-adịkwa nʼebe ahụ ụbọchị niile.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.