Native Bible

1 Kings 8:63 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Solomọn chụrụ aja udo, bụ nke ọ chụrụ nye Onyenwe anyị. Ehi dị puku iri abụọ na abụọ, na ewu na atụrụ dị narị puku na iri puku abụọ. Ya mere, eze na ndị Izrel niile si otu a doo ụlọnsọ Onyenwe anyị nsọ.

1 Kings 8:63 in English

1 Kings 8:63 · Berean Standard Bible

And Solomon offered as peace offerings to the LORD 22,000 oxen and 120,000 sheep. So the king and all the Israelites dedicated the house of the LORD.

Context

61Ya mere, werenụ obi unu nyechasịa Onyenwe anyị bụ Chineke anyị, kpamkpam, na-ebinụ ndụ nʼụkpụrụ ya, rubenụ isi nʼiwu ya, dịka ọ dị taa.” 62Mgbe ahụ, eze ya na ndị Izrel niile chụrụ aja dị iche iche nʼihu Onyenwe anyị. 63Solomọn chụrụ aja udo, bụ nke ọ chụrụ nye Onyenwe anyị. Ehi dị puku iri abụọ na abụọ, na ewu na atụrụ dị narị puku na iri puku abụọ. Ya mere, eze na ndị Izrel niile si otu a doo ụlọnsọ Onyenwe anyị nsọ. 64Nʼotu ụbọchị ahụ kwa, eze doro etiti ogige dị nʼihu ụlọnsọ Onyenwe anyị ahụ nsọ. Nʼebe ahụ ka ọ nọ chụọ aja nsure ọkụ, aja onyinye mkpụrụ ọka na aja abụba udo. O mere nke a nʼihi na ebe ịchụ aja bronz nke na-eguzo nʼihu Chineke dị oke nta ịbata aja nsure ọkụ niile, aja mkpụrụ ọka niile nakwa aja abụba udo niile ahụ. 65Ya mere, Solomọn ya na ndị Izrel niile mere mmemme a nʼoge ahụ, ọ bụ nzukọ dị ukwuu. Ndị mmadụ bịara sitere na Lebo Hamat ruo na mmiri iyi Ijipt. Ha mere mmemme a nʼihu Onyenwe anyị Chineke anyị, ụbọchị asaa tinyere ụbọchị asaa ọzọkwa, ya bụ agụkọta ha ụbọchị iri na anọ.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.