Native Bible

1 Kings 8:59 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Ka okwu m ndị a niile, nke m ji rịọ amara nʼihu Onyenwe anyị dịkwa Onyenwe anyị Chineke anyị nso ehihie na abalị. Ka o nyekwara ohu ya na ndị Izrel niile aka, dịka mkpa ụbọchị ọbụla si dị.

1 Kings 8:59 in English

1 Kings 8:59 · Berean Standard Bible

And may these words with which I have made my petition before the LORD be near to the LORD our God day and night, so that He may uphold the cause of His servant and of His people Israel as each day requires,

Context

57Ka Onyenwe anyị Chineke anyị dịnyere anyị, dịka o si dịnyere nna nna anyị ha. Ka ọ gharakwa ịhapụ anyị, maọbụ gbakụta anyị azụ. 58Ya nyekwa anyị mmụọ ime ihe niile ọ chọrọ, dịka uche nsọ ya si dị, na mmụọ ijezi ije nʼụzọ ya niile, na idebe ụkpụrụ na iwu niile nke o nyere nna nna anyị ha. 59Ka okwu m ndị a niile, nke m ji rịọ amara nʼihu Onyenwe anyị dịkwa Onyenwe anyị Chineke anyị nso ehihie na abalị. Ka o nyekwara ohu ya na ndị Izrel niile aka, dịka mkpa ụbọchị ọbụla si dị. 60Ka ndị niile bi nʼụwa mara na Onyenwe anyị bụ Chineke, marakwa na o nweghị chi ọzọ dị karịa ya. 61Ya mere, werenụ obi unu nyechasịa Onyenwe anyị bụ Chineke anyị, kpamkpam, na-ebinụ ndụ nʼụkpụrụ ya, rubenụ isi nʼiwu ya, dịka ọ dị taa.”

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.