Native Bible

1 Kings 8:34 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

biko, site nʼeluigwe nụrụ ekpere ha, gbaghara mmehie ndị gị Izrel. Meekwa ka ha lọghachita nʼala ahụ nke i nyere nna nna ha.

1 Kings 8:34 in English

1 Kings 8:34 · Berean Standard Bible

then may You hear from heaven and forgive the sin of Your people Israel. May You restore them to the land You gave to their fathers.

Context

32Mgbe ahụ, nụrụ olu ya nʼeluigwe ma mee ihe ziri ezi. Kpeekwa ikpe nʼetiti ndị ohu gị, maa onye mejọrọ ikpe site nʼịtụkwasị nʼisi ha ihe o metara, meekwa ka onye aka ya dị ọcha nwere onwe ya, site nʼimeso ha dịka ezi omume ha si dị. 33“Mgbe ndị iro meriri ndị gị Izrel, nʼihi na ha mehiere megide gị, ọ bụrụ na ha alọghachikwute gị, too aha gị, na-ekpe ekpere, na-arịọ gị arịrịọ nʼụlọnsọ ukwu a, 34biko, site nʼeluigwe nụrụ ekpere ha, gbaghara mmehie ndị gị Izrel. Meekwa ka ha lọghachita nʼala ahụ nke i nyere nna nna ha. 35“Mgbe e gbochiri eluigwe, mee na mmiri adịghị ezokwa, nʼihi na ndị gị emehiela megide gị, ọ bụrụ na ha echee ihu nʼebe a kpee ekpere, too aha gị, si na mmehie ha chegharịa, nʼihi na ịtaala ha ahụhụ. 36Biko, site nʼeluigwe nụrụ ma gbagharakwa mmehie ndị ohu gị, bụ ndị gị Izrel. Kuziere ha ezi ụzọ ha ga-esi bie ndụ ma zidata mmiri ozuzo nʼala ahụ nke i nyere ndị gị ka ọ bụrụ ihe nketa ha.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.