Native Bible

1 Kings 8:3 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Mgbe ndị okenye Izrel niile bịarutere, ndị nchụaja buliri igbe ọgbụgba ndụ ahụ.

1 Kings 8:3 in English

1 Kings 8:3 · Berean Standard Bible

When all the elders of Israel had arrived, the priests took up the ark,

Context

1Mgbe ahụ, eze Solomọn kpọkọtara ndị okenye Izrel, na ndịisi ebo niile, na ndịisi ezinaụlọ Izrel niile, ka ha bịakwute eze na Jerusalem, maka i site na Zayọn bụ obodo Devid bugota igbe ọgbụgba ndụ Onyenwe anyị. 2Ndị Izrel niile gbakọtara bịakwute eze Solomọn nʼoge a na-eme mmemme nʼọnwa Etanim* nke bụ ọnwa asaa nʼafọ. 3Mgbe ndị okenye Izrel niile bịarutere, ndị nchụaja buliri igbe ọgbụgba ndụ ahụ. 4Ha bugotara igbe ọgbụgba ndụ Onyenwe anyị, ya na ụlọ nzute, na ngwongwo niile dị nsọ dị nʼime ya. Ndị nchụaja na ndị Livayị buliri ha elu. 5Eze Solomọn na ọgbakọ Izrel niile, bụ ndị zukọtara nʼebe ọ nọ, nọ nʼihu igbe ọgbụgba ndụ ahụ, na-achụ aja ọtụtụ atụrụ na ọtụtụ ehi nke a na-apụghị ịgụta ọnụ maọbụ gbakọta ọnụọgụgụ ha nʼihi ịba ụba.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.