1 Ndị Eze 8:20
1 Kings 8:20 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
“Ugbu a, Onyenwe anyị emezuola nkwa ahụ o kwere. A nọchiela m nna m Devid, ugbu a, ana m anọdụ nʼocheeze nke Izrel dịka Onyenwe anyị kwere na nkwa. Ewuokwala m ụlọnsọ ukwu nye Aha Onyenwe anyị, bụ Chineke nke Izrel.
1 Kings 8:20 in English
1 Kings 8:20 · Berean Standard Bible
Now the LORD has fulfilled the word that He spoke. I have succeeded my father David, and I sit on the throne of Israel, as the LORD promised. I have built the house for the Name of the LORD, the God of Israel.
Context
18Ma Onyenwe anyị sịrị nna m, Devid, ‘I mere nke ọma ibu nʼobi iwu ụlọnsọ ukwu nye Aha m. 19Ma otu ọ dị, ọ bụghị gị ga-ewu ụlọnsọ ukwu ahụ, kama ọ bụ nwa gị nwoke, anụ ahụ gị na ọbara gị; ọ bụ ya ga-ewu ụlọnsọ ukwu nye Aha m.’ 20“Ugbu a, Onyenwe anyị emezuola nkwa ahụ o kwere. A nọchiela m nna m Devid, ugbu a, ana m anọdụ nʼocheeze nke Izrel dịka Onyenwe anyị kwere na nkwa. Ewuokwala m ụlọnsọ ukwu nye Aha Onyenwe anyị, bụ Chineke nke Izrel. 21Edoziekwala m ọnọdụ ebe igbe ọgbụgba ndụ ahụ ga-adị, nʼime ya ka ọgbụgba ndụ Onyenwe anyị dị, bụ nke ya na nna nna anyị ha gbara, mgbe o mere ka ha si nʼala Ijipt pụta.” 22Mgbe ahụ, Solomọn guzoro nʼihu ebe ịchụ aja Onyenwe anyị, na nʼihu ọgbakọ ụmụ Izrel niile, gbasapụ aka ya abụọ chilie ha elu,
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.