1 Ndị Eze 8:18
1 Kings 8:18 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ma Onyenwe anyị sịrị nna m, Devid, ‘I mere nke ọma ibu nʼobi iwu ụlọnsọ ukwu nye Aha m.
1 Kings 8:18 in English
1 Kings 8:18 · Berean Standard Bible
But the LORD said to my father David, ‘Since it was in your heart to build a house for My Name, you have done well to have this in your heart.
Context
16‘Site nʼụbọchị ahụ m si nʼala Ijipt kpọpụta ndị m, ahọpụtaghị m obodo ọbụla nʼebo ọbụla nke Izrel, ka e wuru m ụlọnsọ ka Aha m dịrị nʼebe ahụ. Ma a họrọla m Devid ị bụ onye ga-achị ndị m Izrel.’ 17“Nna m, Devid bu nʼobi iwu ụlọnsọ ukwu nye Aha Onyenwe anyị, bụ Chineke nke Izrel. 18Ma Onyenwe anyị sịrị nna m, Devid, ‘I mere nke ọma ibu nʼobi iwu ụlọnsọ ukwu nye Aha m. 19Ma otu ọ dị, ọ bụghị gị ga-ewu ụlọnsọ ukwu ahụ, kama ọ bụ nwa gị nwoke, anụ ahụ gị na ọbara gị; ọ bụ ya ga-ewu ụlọnsọ ukwu nye Aha m.’ 20“Ugbu a, Onyenwe anyị emezuola nkwa ahụ o kwere. A nọchiela m nna m Devid, ugbu a, ana m anọdụ nʼocheeze nke Izrel dịka Onyenwe anyị kwere na nkwa. Ewuokwala m ụlọnsọ ukwu nye Aha Onyenwe anyị, bụ Chineke nke Izrel.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.