Native Bible

1 Kings 7:25 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

E mekwara ka Oke osimiri ahụ guzo nʼelu ehi iri na abụọ. Atọ na-eche ihu nʼakụkụ ọwụwa anyanwụ; atọ na-eche ihu nʼọdịda anyanwụ; atọ na-eche ihu nʼakụkụ ndịda, atọ na-eche ihu nʼakụkụ ugwu. Oke osimiri ahụ dịkwasịrị ha nʼelu, ebe azụ ha niile dị nʼime nʼetiti.

1 Kings 7:25 in English

1 Kings 7:25 · Berean Standard Bible

The Sea stood on twelve oxen, three facing north, three facing west, three facing south, and three facing east. The Sea rested on them, with all their hindquarters toward the center.

Context

23O mekwara Oke osimiri* nke ọla awụrụ awụ, nke dị gburugburu nʼụdịdị. Ọtụtụ ya bụ mita abụọ na ụma atọ nʼogologo, dịkwa mita ise na ụma atọ, site nʼotu ọnụ ruo nʼọnụ nke ọzọ. Ọ bụ eriri e ji atụ ihe ruru ihe dịka mita iri na anọ ka e ji tụọ ya gburugburu. 24Nʼokpuru ọnụ ya, oyiyi ọba gbara ya gburugburu, iri dị na mita anọ na ọkara ọbụla. Ọba ndị a dị nʼahịrị abụọ, awụkọtara ha na Oke osimiri ahụ otu mgbe. 25E mekwara ka Oke osimiri ahụ guzo nʼelu ehi iri na abụọ. Atọ na-eche ihu nʼakụkụ ọwụwa anyanwụ; atọ na-eche ihu nʼọdịda anyanwụ; atọ na-eche ihu nʼakụkụ ndịda, atọ na-eche ihu nʼakụkụ ugwu. Oke osimiri ahụ dịkwasịrị ha nʼelu, ebe azụ ha niile dị nʼime nʼetiti. 26Ịdị arọ ya ha ka otu ọtụtụ ntu-aka dimkpa. E mere ọnụ ya ka ọ dị ka ọnụ iko mmiri, dịkwa ka okoko lili na-awapụta awapụta. Ọ na-erite puku galọọnụ iri na abụọ. 27O mekwara ihe ndọkwasị bronz iri, nke e nwere ike ịkpụgharị akpụgharị. Mita abụọ ka ogologo nke otu ihe ndọkwasị ọbụla dị, mita abụọ ka obosara ya dịkwa; ịdị elu ya dị otu mita na ọkara.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.