Native Bible

1 Kings 7:14 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Nne Huram bụ nwanyị si nʼebo Naftalị nke di ya nwụrụ anwụ, ma nna ya bụ onye Taịa, onye maara ǹka dị nʼịkpụ bronz. Huram jupụtara nʼamamihe na nghọta nʼihe ọmụma ịrụ ọrụ ọbụla metụtara bronz. Ọ bịakwutere eze bụ Solomọn, rụọkwa ọrụ niile enyere ya ịrụ.

1 Kings 7:14 in English

1 Kings 7:14 · Berean Standard Bible

He was the son of a widow from the tribe of Naphtali, and his father was a man of Tyre, a craftsman in bronze. Huram had great skill, understanding, and knowledge for every kind of bronze work. So he came to King Solomon and carried out all his work.

Context

12Ogige ukwu ahụ bụ nke eji ahịrị nkume atọ a wara awa dịkwasịrị nʼelu ibe ya gbaa gburugburu, otu ahịrị bụ nke sida a wara awa dịka ọ dị nʼime ime ogige ụlọnsọ ukwu Onyenwe anyị ahụ, ya na mpụta ọnụ ụlọ ya. 13Eze Solomọn zigara ozi na Taịa, ka a kpọta Huram. 14Nne Huram bụ nwanyị si nʼebo Naftalị nke di ya nwụrụ anwụ, ma nna ya bụ onye Taịa, onye maara ǹka dị nʼịkpụ bronz. Huram jupụtara nʼamamihe na nghọta nʼihe ọmụma ịrụ ọrụ ọbụla metụtara bronz. Ọ bịakwutere eze bụ Solomọn, rụọkwa ọrụ niile enyere ya ịrụ. 15Ọ kpụrụ ogidi bronz abụọ, nke ọtụtụ ya ruru mita asatọ na otu ụma nʼogologo, na mita ise na ụma anọ gburugburu ya. 16Ọ kpụkwara ihe ọkpụkpụ bronz, nke isi ya yiri ọnụ ite mmiri. A dọkwasịrị ha nʼelu ogidi ọla abụọ ahụ. Otu nʼime ihe ọkpụkpụ bronz abụọ ndị a dị ihe ruru mita abụọ na ụma atọ nʼogologo.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.