Native Bible

1 Kings 7:1 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Solomọn ji afọ iri na atọ wuo ụlọ nke ya, bịa ruchakwaa ụlọ ya niile.

1 Kings 7:1 in English

1 Kings 7:1 · Berean Standard Bible

Solomon, however, took thirteen years to complete the construction of his entire palace.

Context

1Solomọn ji afọ iri na atọ wuo ụlọ nke ya, bịa ruchakwaa ụlọ ya niile. 2O wuru ụlọeze ukwu aha ya bụ Oke Ọhịa Lebanọn,* nke ogologo ya dị iri mita ise, obosara ya dị iri mita abụọ na ise. Otu a kwa, ịdị elu ya dị mita iri na ise. Osisi sida ukwu e ji rụọ elu ya ka e mere ka ha nọkwasị nʼelu ogidi e doro nʼahịrị nʼahịrị. Ahịrị ogidi ndị a dịkwa anọ. 3Ọ bụkwa osisi sida ka e ji machie elu ụlọ ahụ. A kụkwasịrị osisi ndị a nʼelu osisi sida ukwu ndị a a wara awa, ndị e mere ka ha nọkwasị nʼogidi ndị ahụ. Ọnụọgụgụ osisi ndị ahụ bụ iri anọ na ise. Ọ bụkwa iri na ise ka e nwere nʼahịrị ọbụla.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.