1 Ndị Eze 6:23
1 Kings 6:23 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
O mere cherubim abụọ, nke e ji osisi oliv tụọ nʼime ime ebe nsọ ahụ, ịdị elu nke ọbụla bụ mita ise.
1 Kings 6:23 in English
1 Kings 6:23 · Berean Standard Bible
In the inner sanctuary he made two cherubim, each ten cubits high, out of olive wood.
Context
21Solomọn ji ọlaedo a nụchara anụcha machie ahụ ime ụlọnsọ ukwu ahụ. Ọ gbatịrị ụdọ ọlaedo gafere nʼihu ime ime ebe nsọ ahụ, nke e jikwa ọlaedo machie. 22Ya mere, o ji ọlaedo machie ime ya niile. O jikwa ọlaedo machie ebe ịchụ aja nke dịịrị ime ime ebe nsọ ahụ. 23O mere cherubim abụọ, nke e ji osisi oliv tụọ nʼime ime ebe nsọ ahụ, ịdị elu nke ọbụla bụ mita ise. 24Cherub nke mbụ nwere nku abụọ, otu nku dị mita abụọ na ụma atọ nʼogologo, nku nke ọzọ dịkwa mita abụọ na ụma atọ nʼogologo. Ya bụ, mita ise site na ụma isii, site nʼọnụ otu nku ruo nʼọnụ nku nke ọzọ. 25Cherub nke abụọ dịkwa iri mita na ụma isii, nʼihi na cherubim abụọ ndị a bụ otu nʼọtụtụ nakwa nʼibu ibu.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.