Native Bible

1 Kings 6:21 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Solomọn ji ọlaedo a nụchara anụcha machie ahụ ime ụlọnsọ ukwu ahụ. Ọ gbatịrị ụdọ ọlaedo gafere nʼihu ime ime ebe nsọ ahụ, nke e jikwa ọlaedo machie.

1 Kings 6:21 in English

1 Kings 6:21 · Berean Standard Bible

So Solomon overlaid the inside of the temple with pure gold, and he extended gold chains * across the front of the inner sanctuary, which was overlaid with gold.

Context

19Ọ kwadokwara ebe nsọ ahụ, ebe dị nʼime ime ụlọ ahụ, maka idebe igbe ọgbụgba ndụ Onyenwe anyị nʼebe ahụ. 20Ime ime ebe nsọ ahụ, dị mita iri nʼogologo, obosara ya dịkwa mita iri, ịdị elu ya dịkwa mita iri.** O ji ọlaedo a nụchara anụcha machie ahụ ime ụlọ a niile, jiri osisi sida machie ebe nchụaja ya. 21Solomọn ji ọlaedo a nụchara anụcha machie ahụ ime ụlọnsọ ukwu ahụ. Ọ gbatịrị ụdọ ọlaedo gafere nʼihu ime ime ebe nsọ ahụ, nke e jikwa ọlaedo machie. 22Ya mere, o ji ọlaedo machie ime ya niile. O jikwa ọlaedo machie ebe ịchụ aja nke dịịrị ime ime ebe nsọ ahụ. 23O mere cherubim abụọ, nke e ji osisi oliv tụọ nʼime ime ebe nsọ ahụ, ịdị elu nke ọbụla bụ mita ise.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.