1 Ndị Eze 22:8
1 Kings 22:8 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Eze Izrel zaghachiri Jehoshafat, sị, “A ka nwere otu onye amụma, onye anyị nwere ike isite nʼaka ya jụọ Onyenwe anyị ase, ọ bụ Maikaya nwa Imla,* ma akpọrọ m ya asị, nʼihi na o nweghị oge ọ na-ebu amụma ihe ọma nʼebe m nọ, kama ọ bụ naanị nke ọjọọ.” Jehoshafat sịrị, “Eze ekwesighị ikwu okwu dị otu a.”
1 Kings 22:8 in English
1 Kings 22:8 · Berean Standard Bible
The king of Israel answered, “There is still one man who can ask the LORD, but I hate him because he never prophesies anything good for me, but only bad. He is Micaiah son of Imlah.” “The king should not say that!” Jehoshaphat replied.
Context
6Ya mere, eze Izrel kpọkọtara ndị amụma, ọnụọgụgụ ha ruru narị ndị ikom anọ, jụọ ha sị, “Ọ bụ m gaa buso Ramọt Gilead agha, ka ọ bụ m hapụ ịga?”
Ha zara, “Gaa, nʼihi na Onyenwe anyị ga-enyefe ha nʼaka eze.” 7Ma Jehoshafat jụrụ, “Ọ bụ na e nwekwaghị onye amụma Onyenwe anyị nọ nʼebe a, onye anyị nwere ike ịjụta ase nʼaka ya?” 8Eze Izrel zaghachiri Jehoshafat, sị, “A ka nwere otu onye amụma, onye anyị nwere ike isite nʼaka ya jụọ Onyenwe anyị ase, ọ bụ Maikaya nwa Imla,* ma akpọrọ m ya asị, nʼihi na o nweghị oge ọ na-ebu amụma ihe ọma nʼebe m nọ, kama ọ bụ naanị nke ọjọọ.”
Jehoshafat sịrị, “Eze ekwesighị ikwu okwu dị otu a.” 9Mgbe ahụ, eze Izrel kpọrọ otu onye na-ejere ya ozi sị ya, “Mee ọsịịsọ kpọta Maikaya nwa Imla nʼebe a.” 10Ehab eze Izrel na Jehoshafat eze Juda, onye ọbụla yi uwe eze ya, na-anọkwasị nʼocheeze ya nʼebe ịzọcha ọka nʼọnụ ụzọ ama e si abata obodo Sameria. Ndị amụma ahụ niile nọkwa na-ebu amụma nʼihu ha.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.