1 Ndị Eze 22:5
1 Kings 22:5 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ma Jehoshafat gwakwara eze Izrel, sị, “Buru ụzọ chọpụta ihe bụ ntụziaka Onyenwe anyị.”
1 Kings 22:5 in English
1 Kings 22:5 · Berean Standard Bible
But Jehoshaphat also said to the king of Israel, “Please inquire first for the word of the LORD.”
Context
3Eze Izrel sịrị ndị ozi ya, “Unu amaghị na ala Ramọt Gilead bụ nke anyị, ma lee na anyị gbara nkịtị ịga napụta ya site nʼaka eze Aram?” 4Ya mere, ọ jụrụ Jehoshafat, “Ị ga-eso m gaa buso Ramọt Gilead agha?”
Jehoshafat zaghachiri eze Izrel, sị, “Otu m dị ka gị onwe gị dị, ndị m bụkwa ndị gị, ịnyịnya m bụkwa nke gị.” 5Ma Jehoshafat gwakwara eze Izrel, sị, “Buru ụzọ chọpụta ihe bụ ntụziaka Onyenwe anyị.” 6Ya mere, eze Izrel kpọkọtara ndị amụma, ọnụọgụgụ ha ruru narị ndị ikom anọ, jụọ ha sị, “Ọ bụ m gaa buso Ramọt Gilead agha, ka ọ bụ m hapụ ịga?”
Ha zara, “Gaa, nʼihi na Onyenwe anyị ga-enyefe ha nʼaka eze.” 7Ma Jehoshafat jụrụ, “Ọ bụ na e nwekwaghị onye amụma Onyenwe anyị nọ nʼebe a, onye anyị nwere ike ịjụta ase nʼaka ya?”
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.