1 Ndị Eze 22:3
1 Kings 22:3 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Eze Izrel sịrị ndị ozi ya, “Unu amaghị na ala Ramọt Gilead bụ nke anyị, ma lee na anyị gbara nkịtị ịga napụta ya site nʼaka eze Aram?”
1 Kings 22:3 in English
1 Kings 22:3 · Berean Standard Bible
who said to his servants, “Do you not know that Ramoth-gilead is ours, but we have failed to take it from the hand of the king of Aram?”
Context
1Agha ọzọ adaghị nʼetiti Aram na Izrel afọ atọ. 2Ma nʼafọ nke atọ, Jehoshafat, eze Juda, gara ileta Ehab eze Izrel. 3Eze Izrel sịrị ndị ozi ya, “Unu amaghị na ala Ramọt Gilead bụ nke anyị, ma lee na anyị gbara nkịtị ịga napụta ya site nʼaka eze Aram?” 4Ya mere, ọ jụrụ Jehoshafat, “Ị ga-eso m gaa buso Ramọt Gilead agha?”
Jehoshafat zaghachiri eze Izrel, sị, “Otu m dị ka gị onwe gị dị, ndị m bụkwa ndị gị, ịnyịnya m bụkwa nke gị.” 5Ma Jehoshafat gwakwara eze Izrel, sị, “Buru ụzọ chọpụta ihe bụ ntụziaka Onyenwe anyị.”
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.