Native Bible

1 Kings 22:41 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Jehoshafat nwa Asa ghọrọ eze Juda, nʼafọ nke anọ, nke ọchịchị Ehab eze Izrel.

1 Kings 22:41 in English

1 Kings 22:41 · Berean Standard Bible

In the fourth year of Ahab’s reign over Israel, Jehoshaphat son of Asa became king of Judah.

Context

39Ma banyere ihe ndị ọzọ niile mere nʼoge ọchịchị Ehab na ihe niile o mere, ụlọeze o wuru nke o ji ọdụ chọọ mma, na obodo niile o wusiri ike, ọ bụ na e deghị ha nʼakwụkwọ akụkọ ihe mere nʼoge ndị eze Izrel? 40Ehab sooro ndị nna nna ya ha dina nʼọnwụ. Ahazaya nwa ya ghọrọ eze nʼọnọdụ. 41Jehoshafat nwa Asa ghọrọ eze Juda, nʼafọ nke anọ, nke ọchịchị Ehab eze Izrel. 42Jehoshafat gbara iri afọ atọ na ise mgbe ọ malitere ịbụ eze. Ọ chịrị iri afọ abụọ na ise na Jerusalem. Aha nne ya bụ Azuba, nwa Shilhi. 43Nʼihe niile o jere ije nʼụzọ Asa bụ nna ya, o sitekwaghị nʼime ha wezuga onwe ya, o mekwara ihe ziri ezi nʼanya Onyenwe anyị. Naanị na o wezugaghị ebe dị elu niile, nke mere na ndị mmadụ gara nʼihu na-achụ aja, na-esurekwa ihe nsure ọkụ na-esi isi ụtọ nʼebe ahụ niile.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.