Native Bible

1 Kings 22:39 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Ma banyere ihe ndị ọzọ niile mere nʼoge ọchịchị Ehab na ihe niile o mere, ụlọeze o wuru nke o ji ọdụ chọọ mma, na obodo niile o wusiri ike, ọ bụ na e deghị ha nʼakwụkwọ akụkọ ihe mere nʼoge ndị eze Izrel?

1 Kings 22:39 in English

1 Kings 22:39 · Berean Standard Bible

As for the rest of the acts of Ahab, along with all his accomplishments and the ivory palace and all the cities he built, are they not written in the Book of the Chronicles of the Kings of Israel?

Context

37Ya mere, eze nwụrụ, e buta ozu ya nʼobodo Sameria, ebe a nọ lie ya. 38Ha sachara ụgbọ agha ya nʼọdọ mmiri dị na Sameria (ebe ndị akwụna na-asa ahụ). Ụmụ nkịta rachara ọbara ya, dịka okwu Onyenwe anyị kwubiri.* 39Ma banyere ihe ndị ọzọ niile mere nʼoge ọchịchị Ehab na ihe niile o mere, ụlọeze o wuru nke o ji ọdụ chọọ mma, na obodo niile o wusiri ike, ọ bụ na e deghị ha nʼakwụkwọ akụkọ ihe mere nʼoge ndị eze Izrel? 40Ehab sooro ndị nna nna ya ha dina nʼọnwụ. Ahazaya nwa ya ghọrọ eze nʼọnọdụ. 41Jehoshafat nwa Asa ghọrọ eze Juda, nʼafọ nke anọ, nke ọchịchị Ehab eze Izrel.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.