1 Ndị Eze 22:16
1 Kings 22:16 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Eze sịrị ya, “Ugboro ole ka m ga-eme ka ị ṅụọ iyi na ị gaghị agwa m ihe ọzọ, karịa naanị eziokwu nʼaha Onyenwe anyị?”
1 Kings 22:16 in English
1 Kings 22:16 · Berean Standard Bible
But the king said to him, “How many times must I make you swear not to tell me anything but the truth in the name of the LORD?”
Context
14Ma Maikaya sịrị, “Dịka Onyenwe anyị na-adị ndụ, aga m agwa ya naanị ihe Onyenwe anyị gwara m.”* 15Mgbe ọ bịarutere, eze jụrụ ya, “Maikaya, ọ bụ anyị gaa buso Ramọt Gilead agha, ka ọ bụ anyị hapụ?”
Ọ zara, “Gaa, ma nwekwa mmeri, nʼihi na Onyenwe anyị ga-enyefe ya nʼaka eze.” 16Eze sịrị ya, “Ugboro ole ka m ga-eme ka ị ṅụọ iyi na ị gaghị agwa m ihe ọzọ, karịa naanị eziokwu nʼaha Onyenwe anyị?” 17Mgbe ahụ Mikaya zara, “Ahụrụ m Izrel niile ka ha gbasasịrị nʼelu ọtụtụ ugwu dịka atụrụ na-enweghị onye ọzụzụ atụrụ, ma Onyenwe anyị sịrị, ‘Ndị a enweghị onyendu. Ka onye ọbụla laghachi nʼụlọ ya nʼudo.’ ” 18Eze Izrel, sịrị Jehoshafat, “Ọ bụ na m agwaghị gị na ọ dịghị mgbe ọ na-ebu amụma ihe ọma banyere m, kama naanị ihe ọjọọ?”
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.