1 Ndị Eze 22:15
1 Kings 22:15 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Mgbe ọ bịarutere, eze jụrụ ya, “Maikaya, ọ bụ anyị gaa buso Ramọt Gilead agha, ka ọ bụ anyị hapụ?” Ọ zara, “Gaa, ma nwekwa mmeri, nʼihi na Onyenwe anyị ga-enyefe ya nʼaka eze.”
1 Kings 22:15 in English
1 Kings 22:15 · Berean Standard Bible
When Micaiah arrived, the king asked him, “Micaiah, should we go to war against Ramoth-gilead, or should we refrain?” “Go up and triumph,” Micaiah replied, “for the LORD will give it into the hand of the king.”
Context
13Onyeozi ahụ nke gara ịkpọ Maikaya sịrị ya, “Lee, ndị amụma ndị ọzọ na-agụpụghị onye ọbụla na-ebu amụma ọganihu nye eze. Mee ka okwu gị na ha dakọta. Kwuokwa ihe ga-adị eze mma.” 14Ma Maikaya sịrị, “Dịka Onyenwe anyị na-adị ndụ, aga m agwa ya naanị ihe Onyenwe anyị gwara m.”* 15Mgbe ọ bịarutere, eze jụrụ ya, “Maikaya, ọ bụ anyị gaa buso Ramọt Gilead agha, ka ọ bụ anyị hapụ?”
Ọ zara, “Gaa, ma nwekwa mmeri, nʼihi na Onyenwe anyị ga-enyefe ya nʼaka eze.” 16Eze sịrị ya, “Ugboro ole ka m ga-eme ka ị ṅụọ iyi na ị gaghị agwa m ihe ọzọ, karịa naanị eziokwu nʼaha Onyenwe anyị?” 17Mgbe ahụ Mikaya zara, “Ahụrụ m Izrel niile ka ha gbasasịrị nʼelu ọtụtụ ugwu dịka atụrụ na-enweghị onye ọzụzụ atụrụ, ma Onyenwe anyị sịrị, ‘Ndị a enweghị onyendu. Ka onye ọbụla laghachi nʼụlọ ya nʼudo.’ ”
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.