1 Ndị Eze 20:25
1 Kings 20:25 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Kpọkọtaakwa ndị agha ọzọ, ndị dị ukwuu nʼọnụọgụgụ, dịka ndị agha i du gaa agha na mbụ. Nyekwa anyị ịnyịnya na ụgbọ agha ga-ezuru anyị. Anyị ga-apụkwa buso ndị Izrel agha nʼobosara ala dị larịị. Ọ dịkwaghị ihe ga-egbochi anyị imeri ha nʼoge a.” Ben-Hadad, eze Aram, kwenyere, meere ha dịka ha rịọrọ ya.
1 Kings 20:25 in English
1 Kings 20:25 · Berean Standard Bible
And you must raise an army like the one you have lost—horse for horse and chariot for chariot—so we can fight the Israelites on the plain, where we will surely prevail.” And the king approved their plan and acted accordingly.
Context
23Ma otu ọ dị, ndịisi agha eze ndị Aram dụrụ ya ọdụ sị, “Chi ha bụ chi ugwu. Nʼihi ya ka ha ji dị ike karịa anyị. Ma ọ bụrụ na anyị ebuso ha agha nʼobosara ala dị larịị, anyị aghaghị ịdị ike karịa ha. 24Mee ihe a, wepụ ndị eze a niile site nʼebe ha nọ, jiri ndị na-achị ala gbanwee ha. 25Kpọkọtaakwa ndị agha ọzọ, ndị dị ukwuu nʼọnụọgụgụ, dịka ndị agha i du gaa agha na mbụ. Nyekwa anyị ịnyịnya na ụgbọ agha ga-ezuru anyị. Anyị ga-apụkwa buso ndị Izrel agha nʼobosara ala dị larịị. Ọ dịkwaghị ihe ga-egbochi anyị imeri ha nʼoge a.” Ben-Hadad, eze Aram, kwenyere, meere ha dịka ha rịọrọ ya. 26Mgbe otu afọ gasịrị, Ben-Hadad chịkọtakwara ndị Aram niile duru ha gaa Afek ibuso Izrel agha. 27Mgbe a kpọkọtara ndị agha niile nọ nʼIzrel nye ha ngwa agha, ha pụrụ izute ha. Ndị agha Izrel mara ụlọ ikwu ha na ncherita ihu ndị agha Siria, dịka igwe ewu nta abụọ, ebe ndị Aram jupụtara ala ahụ niile.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.