Native Bible

1 Kings 20:23 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Ma otu ọ dị, ndịisi agha eze ndị Aram dụrụ ya ọdụ sị, “Chi ha bụ chi ugwu. Nʼihi ya ka ha ji dị ike karịa anyị. Ma ọ bụrụ na anyị ebuso ha agha nʼobosara ala dị larịị, anyị aghaghị ịdị ike karịa ha.

1 Kings 20:23 in English

1 Kings 20:23 · Berean Standard Bible

Meanwhile, the servants of the king of Aram said to him, “Their gods are gods of the hills. That is why they prevailed over us. Instead, we should fight them on the plains; surely then we will prevail.

Context

21Ma eze ndị Izrel pụkwuru ya, nwude ọtụtụ ịnyịnya na ụgbọ agha, butere ndị Aram ọghọm dị ukwuu. 22Emesịa, onye amụma ahụ bịakwutere eze Izrel sị ya, “Mee onwe gị ka ị dị ike nke ọma, mara ihe e kwesiri ka e mee, nʼihi nʼetiti ọkọchị na udu mmiri nke afọ nʼabịa, eze Aram ga-abịa ibuso gị agha ọzọ.” 23Ma otu ọ dị, ndịisi agha eze ndị Aram dụrụ ya ọdụ sị, “Chi ha bụ chi ugwu. Nʼihi ya ka ha ji dị ike karịa anyị. Ma ọ bụrụ na anyị ebuso ha agha nʼobosara ala dị larịị, anyị aghaghị ịdị ike karịa ha. 24Mee ihe a, wepụ ndị eze a niile site nʼebe ha nọ, jiri ndị na-achị ala gbanwee ha. 25Kpọkọtaakwa ndị agha ọzọ, ndị dị ukwuu nʼọnụọgụgụ, dịka ndị agha i du gaa agha na mbụ. Nyekwa anyị ịnyịnya na ụgbọ agha ga-ezuru anyị. Anyị ga-apụkwa buso ndị Izrel agha nʼobosara ala dị larịị. Ọ dịkwaghị ihe ga-egbochi anyị imeri ha nʼoge a.” Ben-Hadad, eze Aram, kwenyere, meere ha dịka ha rịọrọ ya.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.