Native Bible

1 Kings 2:13 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Otu ụbọchị, Adonaịja nwa Hagit, bịakwutere Batsheba, nne Solomọn. Mgbe Batsheba hụrụ ya, ọ jụrụ ya ajụjụ sị, “Ọ bụkwa ọbịbịa udo ka ị bịara?” Adonaịja zara sị ya, “E, abịara m nʼudo.”

1 Kings 2:13 in English

1 Kings 2:13 · Berean Standard Bible

Now Adonijah son of Haggith went to Bathsheba the mother of Solomon, and she asked, “Do you come in peace?” “Yes, in peace,” he replied.

Context

11Ma ọ chịrị Izrel iri afọ anọ; ọ chịrị afọ asaa na Hebrọn, chịakwa iri afọ atọ na atọ na Jerusalem. 12Solomọn nọdụrụ nʼocheeze nna ya Devid dịka eze. Alaeze ya guzosiri ike nke ukwuu. Ọchịchị ya gakwara nke ọma. 13Otu ụbọchị, Adonaịja nwa Hagit, bịakwutere Batsheba, nne Solomọn. Mgbe Batsheba hụrụ ya, ọ jụrụ ya ajụjụ sị, “Ọ bụkwa ọbịbịa udo ka ị bịara?” Adonaịja zara sị ya, “E, abịara m nʼudo.” 14O kwuru sị, “O nwere ihe m nwere ịgwa gị.” Nne Solomọn zara sị ya, “Kwuo.” 15Ọ zara sị, “Dịka ị maara, ọ bụ m nwe alaeze a. Ndị Izrel niile lekwara anya na m ga-abụ eze ha. Ma otu ọ dị, ihe niile adịghịkwa ka ọ dị na mbụ, alaeze a aghọọla nke nwanne m, nʼihi na o si nʼaka Onyenwe anyị rute ya aka.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.