1 Ndị Eze 19:8
1 Kings 19:8 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ịlaịja biliri rie ihe, ṅụọkwa mmiri. Nri ahụ nyere ya ike ije ije iri ụbọchị anọ ọzọ, ehihie na abalị, tutu ruo mgbe ọ bịaruru nʼugwu Horeb* nke bụ ugwu Chineke.
1 Kings 19:8 in English
1 Kings 19:8 · Berean Standard Bible
So he got up and ate and drank. And strengthened by that food, he walked forty days and forty nights until he reached Horeb,* the mountain of God.
Context
6Ịlaịja biliri legharịa anya, hụ ogbe achịcha na ite mmiri nta nke dị nʼakụkụ ebe ọ tụkwasịrị isi ya. O riri ogbe achịcha ahụ a hụrụ nʼicheku ọkụ, ṅụọkwa mmiri ahụ. Emesịa, o dinakwara ọzọ. 7Mmụọ ozi nke Onyenwe anyị bịaghachikwara nke ugboro abụọ, sị ya, “Bilie rie ihe, nʼihi na ije dị gị nʼihu dị ukwuu.” 8Ịlaịja biliri rie ihe, ṅụọkwa mmiri. Nri ahụ nyere ya ike ije ije iri ụbọchị anọ ọzọ, ehihie na abalị, tutu ruo mgbe ọ bịaruru nʼugwu Horeb* nke bụ ugwu Chineke. 9Nʼebe ahụ, ọ banyere nʼotu ọgba nkume rahụ ụra abalị nʼime ya. 10(9) Ma okwu Onyenwe anyị rutere ya sị, “Ịlaịja, gịnị ka ị na-eme nʼebe a?”
(10) Ọ zaghachiri sị, “Eji m ịnụ ọkụ nʼobi na-ejere Onyenwe anyị Chineke Onye pụrụ ime ihe niile ozi. Ndị Izrel ajụla ọgbụgba ndụ gị, tidasịakwa ebe ịchụ aja gị, were mma agha gbukwaa ndị amụma gị niile, ugbu a, ọ bụ naanị mụ onwe m bụ onye fọdụrụ, ma ha na-achọkwa iwepụ ndụ m.”
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.