1 Ndị Eze 18:6
1 Kings 18:6 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ha kere ala ahụ nʼetiti onwe ha. Ehab sitere otu akụkụ, ma Ọbadaya sitere akụkụ nke ọzọ.
1 Kings 18:6 in English
1 Kings 18:6 · Berean Standard Bible
So they divided the land to explore. Ahab went one way by himself, and Obadiah went the other way by himself.
Context
4Mgbe eze nwanyị bụ Jezebel na-egbu ndị amụma Onyenwe anyị chọọ igbuchapụ ha, ọ bụ Ọbadaya zoro narị ndị amụma nʼime ha nʼime ọgba nkume. O zoro iri ndị amụma ise nʼotu ọgba nkume, zookwa iri ndị amụma ise fọdụrụ nʼime ọgba nkume ọzọ. Emesịa, ọ na-ewegara ha nri na mmiri nʼebe ahụ.) 5Ehab kpọrọ Ọbadaya sị ya, “Jegharịa nʼala a niile nyochapụta na ndagwurugwu na isi iyi niile, ebe ahịhịa ndụ dị. Gbutere ịnyịnya na ịnyịnya muul m ahịhịa ahụ ka ha taa ghara ịnwụ, ka anyị gharakwa igbu ha.” 6Ha kere ala ahụ nʼetiti onwe ha. Ehab sitere otu akụkụ, ma Ọbadaya sitere akụkụ nke ọzọ. 7Ọ dịghị anya, na mberede, Ọbadaya hụrụ Ịlaịja ka ọ na-abịa izute ya. Ọbadaya matara na ọ bụ ya. Nʼihi ya, ọ dara nʼala kpuo ihu ya nʼala sị, “Ọ bụ gị ka m hụrụ nʼezie, onyenwe m, Ịlaịja?” 8Ịlaịja zara sị ya, “E, ọ bụ m. Ugbu a gaa gwa onyenwe gị, ‘mụ bụ Ịlaịja nọ nʼebe a.’ ”
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.