Native Bible

1 Kings 18:22 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Mgbe ahụ Ịlaịja sịrị ha, “Leenụ! Ọ bụ mụ onwe m, naanị m, bụ onye amụma Onyenwe anyị fọdụrụ, ma ndị amụma Baal dị narị anọ na iri ise nʼọnụọgụgụ.

1 Kings 18:22 in English

1 Kings 18:22 · Berean Standard Bible

Then Elijah said to the people, “I am the only remaining prophet of the LORD, but Baal has four hundred and fifty prophets.

Context

20Ehab zigara ozi kpọkọta ndị Izrel niile, na ndị amụma ahụ niile. Ha niile bịakwara nʼugwu Kamel. 21Ịlaịja gara nʼihu ndị a, sị ha, “Ọ bụ ruo ole mgbe ka unu ga-akwụsị inwe obi abụọ? Ọ bụrụ na Onyenwe anyị bụ Chineke unu, soronụ ya! Ma ọ bụrụkwanụ na unu ekpebie na Baal bụ chi unu, soronụ ya.” Ma ndị zukọrọ nʼebe ahụ ekwughị ihe ọbụla. 22Mgbe ahụ Ịlaịja sịrị ha, “Leenụ! Ọ bụ mụ onwe m, naanị m, bụ onye amụma Onyenwe anyị fọdụrụ, ma ndị amụma Baal dị narị anọ na iri ise nʼọnụọgụgụ. 23Ugbu a wetanụ oke ehi abụọ ka ndị amụma Baal họrọ otu oke ehi, nke ha chọrọ. Ha ga-egbujasị ya, tụkwasị ya nʼelu nkụ dị nʼebe ịchụ aja, ma ha agaghị amụnye ọkụ ọbụla nʼokpuru ya. Mụ onwe m ga-akwado oke ehi nke ọzọ tụkwasị ya nʼelu nkụ ma agaghị m amụnyekwa ọkụ nʼokpuru ya. 24Emesịa, unu ga-akpọku chi Baal* unu, mụ onwe m kwa ga-akpọku aha Onyenwe anyị. Ọ ga-erukwa na chi ga-eji ọkụ za, chi ahụ bụ Chineke.” Ndị Izrel niile zara sị, “Okwu gị dị mma.”

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.