Native Bible

1 Kings 18:20 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Ehab zigara ozi kpọkọta ndị Izrel niile, na ndị amụma ahụ niile. Ha niile bịakwara nʼugwu Kamel.

1 Kings 18:20 in English

1 Kings 18:20 · Berean Standard Bible

So Ahab summoned all the Israelites and assembled the prophets on Mount Carmel.

Context

18Ịlaịja zara sị Ehab, “O nweghị mgbe m ji butere Izrel nsogbu. Ọ bụ gị onwe gị na ezinaụlọ nna gị na-ebutere Izrel nsogbu. Unu agbakụtala iwu Onyenwe anyị azụ, gbasoro chi Baal dị iche iche.* 19Ugbu a, kpọkọta ndị Izrel niile ka ha zute m nʼugwu Kamel. Kpọpụtakwa ndị amụma Baal ọnụọgụgụ ha dị narị anọ na iri mmadụ ise, na ndị amụma Ashera, ndị dị narị anọ, bụ ndị na-eso eze nwanyị Jezebel erikọ ihe na tebul ya.” 20Ehab zigara ozi kpọkọta ndị Izrel niile, na ndị amụma ahụ niile. Ha niile bịakwara nʼugwu Kamel. 21Ịlaịja gara nʼihu ndị a, sị ha, “Ọ bụ ruo ole mgbe ka unu ga-akwụsị inwe obi abụọ? Ọ bụrụ na Onyenwe anyị bụ Chineke unu, soronụ ya! Ma ọ bụrụkwanụ na unu ekpebie na Baal bụ chi unu, soronụ ya.” Ma ndị zukọrọ nʼebe ahụ ekwughị ihe ọbụla. 22Mgbe ahụ Ịlaịja sịrị ha, “Leenụ! Ọ bụ mụ onwe m, naanị m, bụ onye amụma Onyenwe anyị fọdụrụ, ma ndị amụma Baal dị narị anọ na iri ise nʼọnụọgụgụ.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.