Native Bible

1 Kings 18:17 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Mgbe ọ hụrụ Ịlaịja, Ehab sịrị ya, “Ọ bụ gị onwe gị bụ nke a, gị onye na-emekpa Izrel ahụ?”

1 Kings 18:17 in English

1 Kings 18:17 · Berean Standard Bible

When Ahab saw Elijah, he said to him, “Is that you, O troubler of Israel?”

Context

15Ma Ịlaịja zara sị ya, “Dịka Onyenwe anyị Chineke Onye pụrụ ime ihe niile na-adị ndụ, onye m na-ejere ozi, ana m agwa gị na agaghị m esi nʼebe a pụọ tutu ruo mgbe m gosiri Ehab onwe m taa.” 16Mgbe ahụ, Ọbadaya pụrụ gaa kọọrọ Ehab na Ịlaịja abịala. Emesịa, Ehab pụtara izute Ịlaịja. 17Mgbe ọ hụrụ Ịlaịja, Ehab sịrị ya, “Ọ bụ gị onwe gị bụ nke a, gị onye na-emekpa Izrel ahụ?” 18Ịlaịja zara sị Ehab, “O nweghị mgbe m ji butere Izrel nsogbu. Ọ bụ gị onwe gị na ezinaụlọ nna gị na-ebutere Izrel nsogbu. Unu agbakụtala iwu Onyenwe anyị azụ, gbasoro chi Baal dị iche iche.* 19Ugbu a, kpọkọta ndị Izrel niile ka ha zute m nʼugwu Kamel. Kpọpụtakwa ndị amụma Baal ọnụọgụgụ ha dị narị anọ na iri mmadụ ise, na ndị amụma Ashera, ndị dị narị anọ, bụ ndị na-eso eze nwanyị Jezebel erikọ ihe na tebul ya.”

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.