1 Ndị Eze 18:16
1 Kings 18:16 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Mgbe ahụ, Ọbadaya pụrụ gaa kọọrọ Ehab na Ịlaịja abịala. Emesịa, Ehab pụtara izute Ịlaịja.
1 Kings 18:16 in English
1 Kings 18:16 · Berean Standard Bible
So Obadiah went to inform Ahab, who went to meet Elijah.
Context
14Ma ugbu a i na-agwa m sị m, ‘Gaa gwa onyenwe gị na Ịlaịja abịala.’ Ọ ga-egbukwa m!” 15Ma Ịlaịja zara sị ya, “Dịka Onyenwe anyị Chineke Onye pụrụ ime ihe niile na-adị ndụ, onye m na-ejere ozi, ana m agwa gị na agaghị m esi nʼebe a pụọ tutu ruo mgbe m gosiri Ehab onwe m taa.” 16Mgbe ahụ, Ọbadaya pụrụ gaa kọọrọ Ehab na Ịlaịja abịala. Emesịa, Ehab pụtara izute Ịlaịja. 17Mgbe ọ hụrụ Ịlaịja, Ehab sịrị ya, “Ọ bụ gị onwe gị bụ nke a, gị onye na-emekpa Izrel ahụ?” 18Ịlaịja zara sị Ehab, “O nweghị mgbe m ji butere Izrel nsogbu. Ọ bụ gị onwe gị na ezinaụlọ nna gị na-ebutere Izrel nsogbu. Unu agbakụtala iwu Onyenwe anyị azụ, gbasoro chi Baal dị iche iche.*
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.