1 Ndị Eze 16:31
1 Kings 16:31 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ọ bụghị naanị na ọ gụrụ mmehie niile Jeroboam nwa Nebat mere dị ka ihe dị nta, kama ọ gara nʼihu lụọ Jezebel, nwa nwanyị Etbaal, eze ndị Saịdọn.* O bidokwara ịkpọ isiala nye arụsị Baal, na ife ya ofufe.
1 Kings 16:31 in English
1 Kings 16:31 · Berean Standard Bible
And as if it were not enough for him to walk in the sins of Jeroboam son of Nebat, he even married Jezebel the daughter of Ethbaal king of the Sidonians, and he then proceeded to serve and worship Baal.
Context
29Nʼafọ nke iri atọ na asatọ nke ọchịchị eze Asa na Juda, ka Ehab, nwa Omri, malitere ịchị dịka eze nʼIzrel. Ọ chịrị ndị Izrel iri afọ abụọ na abụọ na Sameria. 30Ehab nwa Omri mere ihe ọjọọ nʼanya Onyenwe anyị karịa ndị eze niile buru ya ụzọ. 31Ọ bụghị naanị na ọ gụrụ mmehie niile Jeroboam nwa Nebat mere dị ka ihe dị nta, kama ọ gara nʼihu lụọ Jezebel, nwa nwanyị Etbaal, eze ndị Saịdọn.* O bidokwara ịkpọ isiala nye arụsị Baal, na ife ya ofufe. 32O guzobere ebe ịchụ aja nye Baal, nʼụlọ arụsị Baal nke o wuru na Sameria. 33Ehab manyere ogidi chi Ashera, si otu a kpasuo Onyenwe anyị bụ Chineke nke Izrel iwe karịa otu ndị eze Izrel niile bu ya ụzọ chịa si mee.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.