1 Ndị Eze 16:24
1 Kings 16:24 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Omri zụrụ ala ugwu ugwu a na-akpọ Sameria site nʼaka Shema, kwụọ ya talenti ọlaọcha abụọ. O wuru obodo ọhụrụ nʼugwu ahụ gụọ aha ya Sameria, nʼihi na aha onyenwe ala ahụ na mbụ bụ Shema.
1 Kings 16:24 in English
1 Kings 16:24 · Berean Standard Bible
He bought the hill of Samaria from Shemer for two talents of silver * and built a city there, calling it Samaria after the name of Shemer, who had owned the hill.
Context
22Ma ndị dịnyeere Omri dị ike karịa ndị dịnyeere Tibni, nwa Ginat. Ya mere, Tibni nwụrụ. Omri ghọkwara eze Izrel. 23Asa, eze Juda anọọla iri afọ atọ na otu dịka eze mgbe Omri malitere ịbụ eze Izrel. Omri chịrị Izrel afọ iri na abụọ, afọ isii nʼime afọ ndị a na Tịaza. 24Omri zụrụ ala ugwu ugwu a na-akpọ Sameria site nʼaka Shema, kwụọ ya talenti ọlaọcha abụọ. O wuru obodo ọhụrụ nʼugwu ahụ gụọ aha ya Sameria, nʼihi na aha onyenwe ala ahụ na mbụ bụ Shema. 25Ma Omri mere ihe ọjọọ nʼanya Onyenwe anyị karịa ndị eze Izrel niile buru ya ụzọ. 26Ọ kpọrọ isiala nye arụsị, dịka Jeroboam nwa Nebat mere. O dubakwara ndị Izrel nʼime mmehie. Nʼihi nke a o mere ka iwe wee Onyenwe anyị, Chineke Izrel, nʼihi arụsị nzuzu ha.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.