Native Bible

1 Kings 16:21 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Ma nʼoge a, ndị Izrel kere onwe ha ụzọ abụọ maka onye ga-abụ eze ha. Otu ụzọ dịnyeere Omri, ndị nke ọzọ dịnyeere Tibni, nwa Ginat.

1 Kings 16:21 in English

1 Kings 16:21 · Berean Standard Bible

At that time the people of Israel were divided: Half of the people supported Tibni son of Ginath as king, and half supported Omri.

Context

19nʼihi na Zimri nʼonwe ya mere ihe ọjọọ nʼanya Onyenwe anyị dịka Jeroboam. Ọ kpọrọ isiala nye arụsị, dubakwa ụmụ Izrel nʼime mmehie. 20Akụkọ banyere Zimri na ihe ọjọọ niile o mere e deghị ha nʼakwụkwọ akụkọ ọchịchị ndị eze Izrel? 21Ma nʼoge a, ndị Izrel kere onwe ha ụzọ abụọ maka onye ga-abụ eze ha. Otu ụzọ dịnyeere Omri, ndị nke ọzọ dịnyeere Tibni, nwa Ginat. 22Ma ndị dịnyeere Omri dị ike karịa ndị dịnyeere Tibni, nwa Ginat. Ya mere, Tibni nwụrụ. Omri ghọkwara eze Izrel. 23Asa, eze Juda anọọla iri afọ atọ na otu dịka eze mgbe Omri malitere ịbụ eze Izrel. Omri chịrị Izrel afọ iri na abụọ, afọ isii nʼime afọ ndị a na Tịaza.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.