Native Bible

1 Kings 15:6 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Agha dị nʼetiti Abija na Jeroboam nʼụbọchị niile nke ndụ Abija.

1 Kings 15:6 in English

1 Kings 15:6 · Berean Standard Bible

And there was war between the houses of Rehoboam * and Jeroboam all the days of Abijam’s life.*

Context

4Ma nʼihi Devid, Onyenwe anyị Chineke ya nyere ya oriọna na Jerusalem, site na-ime ka nwa ya nwoke nọchie ọnọdụ ya nakwa ime ka Jerusalem guzosie ike. 5Nʼihi na Devid mere ihe ziri ezi nʼanya Onyenwe anyị, ọ dịghịkwa iwu Onyenwe anyị ọbụla nke ọ na-edebeghị nʼụbọchị ndụ ya niile, ma ọ bụghị naanị ihe banyere okwu Ụraya, onye Het. 6Agha dị nʼetiti Abija na Jeroboam nʼụbọchị niile nke ndụ Abija. 7Ma banyere ihe ndị ọzọ niile mere nʼoge ọchịchị Abija, o bụ na e deghị ha nʼakwụkwọ akụkọ ndị eze Juda? Agha dịgidere nʼetiti Abija na Jeroboam. 8Abija sooro nna nna ya ha dina nʼọnwụ, e lie ya nʼobodo Devid. Asa, nwa ya nwoke ghọrọ eze nʼọnọdụ ya.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.