Native Bible

1 Kings 15:4 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Ma nʼihi Devid, Onyenwe anyị Chineke ya nyere ya oriọna na Jerusalem, site na-ime ka nwa ya nwoke nọchie ọnọdụ ya nakwa ime ka Jerusalem guzosie ike.

1 Kings 15:4 in English

1 Kings 15:4 · Berean Standard Bible

Nevertheless, for the sake of David, the LORD his God gave him a lamp in Jerusalem by raising up a son to succeed him and to make Jerusalem strong.

Context

2Ọ chịrị afọ atọ na Jerusalem. Aha nne ya bụ Maaka, nwa nwanyị Abishalom. 3O mere mmehie niile nna ya mere nʼihu ya; o jighị obi zuruoke gbasoo Onyenwe anyị Chineke ya, dịka obi nna nna ya Devid dị. 4Ma nʼihi Devid, Onyenwe anyị Chineke ya nyere ya oriọna na Jerusalem, site na-ime ka nwa ya nwoke nọchie ọnọdụ ya nakwa ime ka Jerusalem guzosie ike. 5Nʼihi na Devid mere ihe ziri ezi nʼanya Onyenwe anyị, ọ dịghịkwa iwu Onyenwe anyị ọbụla nke ọ na-edebeghị nʼụbọchị ndụ ya niile, ma ọ bụghị naanị ihe banyere okwu Ụraya, onye Het. 6Agha dị nʼetiti Abija na Jeroboam nʼụbọchị niile nke ndụ Abija.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.