Native Bible

1 Kings 15:11 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Asa mere ihe ziri ezi nʼanya Onyenwe anyị dịka Devid nna ya mere.*

1 Kings 15:11 in English

1 Kings 15:11 · Berean Standard Bible

And Asa did what was right in the eyes of the LORD, as his father David had done.

Context

9Nʼafọ nke iri abụọ nke ọchịchị Jeroboam eze Izrel, ka Asa ghọrọ eze Juda. 10Ọ chịrị iri afọ anọ na otu na Jerusalem. Aha nne nne ya bụ Maaka, nwa nwanyị Abishalom. 11Asa mere ihe ziri ezi nʼanya Onyenwe anyị dịka Devid nna ya mere.* 12O sitere nʼala ahụ niile chụpụ ndị ikom akwụna ụlọ arụsị niile, wezugakwa arụsị niile nke ndị nna nna ya ha mere. 13Ọ chụdakwara ọbụladị nne nne ya bụ Maaka, site nʼọnọdụ ya dịka nne eze, nʼihi na ọ kpụrụ ihe arụ, ogidi Ashera maka iji fee ya ofufe. Asa gbuturu ya kpọọ ya ọkụ na ndagwurugwu iyi Kidrọn.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.