1 Ndị Eze 13:16
1 Kings 13:16 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ma ọ sịrị, “Apụghị m iso gị laghachi azụ, maọbụ rie nri, ma ọ bụkwa ṅụọ mmiri ọbụla nʼebe a.
1 Kings 13:16 in English
1 Kings 13:16 · Berean Standard Bible
But the man replied, “I cannot return with you or eat bread or drink water with you in this place.
Context
14Ọ gbasooro onye nke Chineke nʼazụ, ọ hụrụ ya ka ọ nọ ala nʼokpuru osisi ook, Ọ sịrị ya, “Ọ bụ gị bụ onye nke Chineke ahụ si Juda bịa?”
Ọ zara, “E, ọ bụ mụ onwe m.” 15Onye amụma ahụ sịrị ya, “Soro m ka anyị gaa nʼụlọ m, ka i rie nri.” 16Ma ọ sịrị, “Apụghị m iso gị laghachi azụ, maọbụ rie nri, ma ọ bụkwa ṅụọ mmiri ọbụla nʼebe a. 17Nʼihi na a gwara m site nʼokwu Onyenwe anyị sị, ‘Erikwala nri maọbụ ṅụọ mmiri nʼebe ahụ, maọbụ soro ụzọ ị si gaa lọtakwa.’ ” 18Ma onye nke ọzọ sịrị ya, “Mụ onwe m bụkwa onye amụma dịka gị, mmụọ ozi zikwara m ozi site nʼokwu Onyenwe anyị sị, ‘Kpọrọ ya ka o soro gị laghachi nʼụlọ gị, ka o rie nri, ṅụọkwa mmiri.’ ” (Ma ọ gwara ya okwu ụgha.)
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.