Native Bible

1 Kings 12:21 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Mgbe Rehoboam bịarutere Jerusalem, ọ kpọkọtara ndị ụlọ Juda niile na ndị ebo Benjamin, ha dị narị puku na iri asatọ nʼọnụọgụgụ, ụmụ okorobịa ndị tozuru ịga agha, ka ha gaa buso ụlọ Izrel agha ma weghachitekwa alaeze nʼokpuru ọchịchị Rehoboam, nwa Solomọn.

1 Kings 12:21 in English

1 Kings 12:21 · Berean Standard Bible

And when Rehoboam arrived in Jerusalem, he mobilized the whole house of Judah and the tribe of Benjamin—180,000 chosen warriors—to fight against the house of Israel and restore the kingdom to Rehoboam son of Solomon.

Context

19Ya mere, Izrel nọ na nnupu isi megide ụlọ Devid ruo taa. 20Mgbe ndị Izrel nụrụ na Jeroboam alaghachitala, ha ziri ya ozi sị ya pụta nʼihu ọha mmadụ. Nʼebe ahụ ka ha nọ mee ya eze Izrel. Ọ dịghị ebo ọbụla kwenyere iso ụlọ Devid, karịakwa ebo Juda. 21Mgbe Rehoboam bịarutere Jerusalem, ọ kpọkọtara ndị ụlọ Juda niile na ndị ebo Benjamin, ha dị narị puku na iri asatọ nʼọnụọgụgụ, ụmụ okorobịa ndị tozuru ịga agha, ka ha gaa buso ụlọ Izrel agha ma weghachitekwa alaeze nʼokpuru ọchịchị Rehoboam, nwa Solomọn. 22Ma okwu Chineke rutere Shemaya onye nke Chineke ntị, sị, 23“Gwa Rehoboam, nwa Solomọn eze Juda, na ndị Juda niile, na Benjamin na ndị ọzọ niile, sị ha,

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.