1 Ndị Eze 10:26
1 Kings 10:26 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Solomọn chịkọbara ọtụtụ ụgbọ agha na ịnyịnya dị iche iche. O nwere ụgbọ agha dị otu puku na narị anọ na ịnyịnya agha dị puku iri na abụọ nʼọnụọgụgụ, ndị o debere ụfọdụ nʼime ha nʼobodo ụgbọ agha ya ma ndị ọzọ dị na Jerusalem ebe ya onwe ya nọ.
1 Kings 10:26 in English
1 Kings 10:26 · Berean Standard Bible
Solomon accumulated * 1,400 chariots and 12,000 horses,* which he stationed in the chariot cities and also with him in Jerusalem.
Context
24Ụwa niile na-abịa ịchọ ihu Solomọn ka ha nụta okwu amamihe nke Chineke tinyere nʼobi ya. 25Onye ọbụla bịakwutere ya na-ebutere ya onyinye ịnata ihuọma, ya bụ ngwa ọlaọcha na ọlaedo, uwe dị iche iche, ngwa agha, ụda dị iche iche, ịnyịnya na ịnyịnya muul, nke a bụ kwa afọ, kwa afọ. 26Solomọn chịkọbara ọtụtụ ụgbọ agha na ịnyịnya dị iche iche. O nwere ụgbọ agha dị otu puku na narị anọ na ịnyịnya agha dị puku iri na abụọ nʼọnụọgụgụ, ndị o debere ụfọdụ nʼime ha nʼobodo ụgbọ agha ya ma ndị ọzọ dị na Jerusalem ebe ya onwe ya nọ. 27Eze mere ka ọlaọcha baa ụba dịka nkume efu na Jerusalem. O mekwara ka osisi sida dị ọtụtụ dịka osisi sikamọ nke dị nʼala ala ugwu dị iche iche. 28A na-esite nʼIjipt nakwa ala Kue atụbatara Solomọn ịnyịnya. Ndị ahịa eze na-azụta ha site na Kue nʼọnụ ahịa a na-ere ha nʼoge ahụ.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.