1 Ndị Eze 1:7
1 Kings 1:7 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Adonaịja na Joab, nwa Zeruaya* tinyere Abịata* onye nchụaja, kparịtara ụka. Ha kwenyere inyere ya aka ka ọ ghọọ eze.
1 Kings 1:7 in English
1 Kings 1:7 · Berean Standard Bible
So Adonijah conferred with Joab son of Zeruiah and with Abiathar the priest, who supported him.
Context
5Nʼoge a, Adonaịja* onye nne ya bụ Hagit, wepụtara onwe ya, kwuo sị, “Aga m abụ eze.” Nʼihi nke a, ọ kwadooro onwe ya ụgbọ agha na ọtụtụ ịnyịnya, kpọtakwa iri ndị ikom ise, ndị ga-agba ọsọ nʼihu ya. 6Na ndụ Adonaịja niile, o nweghị oge nna ya baara ya mba site nʼịjụ ya, “Gịnị mere i ji akpa agwa dị otu a?” Ọ bụ nwokorobịa mara mma nke ukwuu; ọ bụ ya na-esotekwa nwanne ya Absalọm. 7Adonaịja na Joab, nwa Zeruaya* tinyere Abịata* onye nchụaja, kparịtara ụka. Ha kwenyere inyere ya aka ka ọ ghọọ eze. 8Ma Zadọk onye nchụaja, Benaya nwa Jehoiada, Netan onye amụma, Shimei, Rei na ndị agha niile na-eche Devid nche esonyeghị Adonaịja. 9Adonaịja chịịrị atụrụ, ehi na ụmụ ehi gbara abụba, gaa nʼakụkụ En-Rogel chụọ aja na Nkume Zohelet. Ọ kpọrọ ụmụnne ya niile bụ ụmụ ndị ikom eze na ndịisi Juda niile, ndị na-ejere eze ozi oku,
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.