1 Ndị Eze 1:44
1 Kings 1:44 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Eze e zigala ya na Zadọk onye nchụaja, na Netan onye amụma, na Benaya nwa Jehoiada, ndị Keret na ndị Pelet sokwa duru ya gaa. Ha mere ka ọ nọkwasị nʼelu ịnyịnya muul eze.
1 Kings 1:44 in English
1 Kings 1:44 · Berean Standard Bible
And with Solomon, the king has sent Zadok the priest, Nathan the prophet, and Benaiah son of Jehoiada, along with the Cherethites and Pelethites, and they have set him on the king’s mule.
Context
42Ma mgbe ọ ka kpụ okwu ahụ nʼọnụ, lee Jonatan nwa Abịata onye nchụaja, ka ọ batara. Adonaịja sịrị, “Bata! Nʼihi na ị bụ ezi mmadụ amaara m na ọ bụ oziọma ka i ji bịa.” 43Jonatan zara ya sị, “Mba, ọ dịghị otu ahụ! Onyenwe anyị eze Devid emeela Solomọn eze. 44Eze e zigala ya na Zadọk onye nchụaja, na Netan onye amụma, na Benaya nwa Jehoiada, ndị Keret na ndị Pelet sokwa duru ya gaa. Ha mere ka ọ nọkwasị nʼelu ịnyịnya muul eze. 45Zadọk onye nchụaja na Netan onye amụma eteela ya mmanụ na Gaihọn ịbụ eze. Ha esitekwala nʼebe ahụ ṅụrụ ọṅụ na-alaghachikwa, ndị obodo niile nọkwa ugbu a na-eme mkpọtụ, na-aṅụrịkwa ọṅụ. Ọ bụkwa ụzụ ọṅụ ha ka unu nụrụ. 46Solomọn na-anọkwasị nʼocheeze ugbu a.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.