Native Bible

1 Kings 1:42 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Ma mgbe ọ ka kpụ okwu ahụ nʼọnụ, lee Jonatan nwa Abịata onye nchụaja, ka ọ batara. Adonaịja sịrị, “Bata! Nʼihi na ị bụ ezi mmadụ amaara m na ọ bụ oziọma ka i ji bịa.”

1 Kings 1:42 in English

1 Kings 1:42 · Berean Standard Bible

As he was speaking, suddenly Jonathan the son of Abiathar the priest arrived. “Come in,” said Adonijah, “for you are a man of valor. You must be bringing good news.”

Context

40Ndị Izrel niile sooro ya rigoo, na-afụ ọja na-aṅụrịkwa oke ọnụ, ruo nʼala mara jijiji nʼihi oke ụzụ. 41Adonaịja na ndị ọbịa ya niile nụrụ mkpu ọṅụ ahụ mgbe ha onwe ha na-erisi nri. Mgbe Joab nụrụ opi ike ka ọ na-ada, ọ jụrụ sị, “Gịnị mere oke ụzụ dị otu a ji na-ada nʼime obodo.” 42Ma mgbe ọ ka kpụ okwu ahụ nʼọnụ, lee Jonatan nwa Abịata onye nchụaja, ka ọ batara. Adonaịja sịrị, “Bata! Nʼihi na ị bụ ezi mmadụ amaara m na ọ bụ oziọma ka i ji bịa.” 43Jonatan zara ya sị, “Mba, ọ dịghị otu ahụ! Onyenwe anyị eze Devid emeela Solomọn eze. 44Eze e zigala ya na Zadọk onye nchụaja, na Netan onye amụma, na Benaya nwa Jehoiada, ndị Keret na ndị Pelet sokwa duru ya gaa. Ha mere ka ọ nọkwasị nʼelu ịnyịnya muul eze.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.