1 Ndị Kọrint 8:6
1 Corinthians 8:6 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ma nʼebe anyị nọ, anyị maara na ọ bụ naanị otu Chineke dị, onye bụ Nna, onye kere ihe niile, na onye anyị na-adị ndụ nʼihi ya. Ọ bụkwa naanị otu Onyenwe anyị ka anyị nwere, onye bụ Jisọs Kraịst, onye e sitere nʼaka ya kee ihe niile, onye na-enyekwa anyị ndụ.
1 Corinthians 8:6 in English
1 Corinthians 8:6 · Berean Standard Bible
yet for us there is but one God, the Father, from whom all things came and for whom we exist. And there is but one Lord, Jesus Christ, through whom all things came and through whom we exist.
Context
4Ya mere, ihe banyere nri a chụrụ nʼaja nye arụsị, anyị maara na “Arụsị abụghị ihe ọbụla nʼụwa”, matakwa na “Chi ọzọ adịghị ma ọ bụghị otu Chineke.” 5A sịkwa na arụsị a na-akpọ chi dị, ma ha nọ nʼeluigwe maọbụ nʼụwa (nʼezie ọtụtụ “chi” na “ndị nwe mmadụ” dị otu a dị). 6Ma nʼebe anyị nọ, anyị maara na ọ bụ naanị otu Chineke dị, onye bụ Nna, onye kere ihe niile, na onye anyị na-adị ndụ nʼihi ya. Ọ bụkwa naanị otu Onyenwe anyị ka anyị nwere, onye bụ Jisọs Kraịst, onye e sitere nʼaka ya kee ihe niile, onye na-enyekwa anyị ndụ. 7Ma otu ọ dị, ọ bụghị onye ọbụla nwere ihe ọmụma a. Ụfọdụ nʼime ndụ ha niile, ha na-ele arụsị anya dịka chi dị ndụ. Ha na-echekwa na ihe ọbụla e ji chụọrọ arụsị aja, na ọ bụ chi dị ndụ ka e ji ya chụọrọ aja. Nʼihi nke a, mgbe ọbụla ha riri ihe e ji chụọ aja nye arụsị, ọ na-ewute mmụọ ha nke ukwuu nʼihi na akọnuche ha esighị ike, ọ na-emerụkwa ya. 8Ma ọ bụghị nri ga-eme ka anyị na Chineke dị na mma. Ma anyị riri ma anyị erighị, ọ dịghị ihe ọhụrụ anyị ga-enweta. Ọ dịkwaghị ihe na-efunarị anyị.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.