Native Bible

1 Corinthians 8:12 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Cheta na ọ bụ mmehie i mere megide Kraịst, mgbe unu na-emegide mmụọ nwanne gị nʼime Kraịst, nʼihi nʼakọnuche ha esighị ike.

1 Corinthians 8:12 in English

1 Corinthians 8:12 · Berean Standard Bible

By sinning against your brothers in this way and wounding their weak conscience, you sin against Christ.

Context

10Nʼihi na ọ bụrụ na ndị ọzọ ahụ gị, gị onye nwere akọnuche, ka ị nọ, na-eri nri nʼụlọ arụsị, ọ bụ na ha agaghị eche na ha bụ ndị okwukwe ha na-esighị ike, ga-enwe obi ike soro gị rie nri a gọrọ arụsị? 11Nʼụzọ dị otu a, ndị kwere ekwe na-adịghị ike, ndị Kraịst nwụrụ nʼihi ha, na-esite nʼihe mmụta gị laa nʼiyi. 12Cheta na ọ bụ mmehie i mere megide Kraịst, mgbe unu na-emegide mmụọ nwanne gị nʼime Kraịst, nʼihi nʼakọnuche ha esighị ike. 13Nʼihi nke a, ọ bụrụ na ihe oriri ga-eme ka nwanna m mee mmehie, agaghị m eri anụ ọzọ, ka m ghara ime ka nwanna m maa nʼọnya.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.