Native Bible

1 Corinthians 8:11 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Nʼụzọ dị otu a, ndị kwere ekwe na-adịghị ike, ndị Kraịst nwụrụ nʼihi ha, na-esite nʼihe mmụta gị laa nʼiyi.

1 Corinthians 8:11 in English

1 Corinthians 8:11 · Berean Standard Bible

So this weak brother, for whom Christ died, is destroyed by your knowledge.

Context

9Ma lezienụ anya, otu o si dị, ka ike unu nwere ime ihe ọbụla dị unu mma, ghara ịghọ ihe ịsọ ngọngọ dịrị ndị na-adịghị ike nʼokwukwe ha. 10Nʼihi na ọ bụrụ na ndị ọzọ ahụ gị, gị onye nwere akọnuche, ka ị nọ, na-eri nri nʼụlọ arụsị, ọ bụ na ha agaghị eche na ha bụ ndị okwukwe ha na-esighị ike, ga-enwe obi ike soro gị rie nri a gọrọ arụsị? 11Nʼụzọ dị otu a, ndị kwere ekwe na-adịghị ike, ndị Kraịst nwụrụ nʼihi ha, na-esite nʼihe mmụta gị laa nʼiyi. 12Cheta na ọ bụ mmehie i mere megide Kraịst, mgbe unu na-emegide mmụọ nwanne gị nʼime Kraịst, nʼihi nʼakọnuche ha esighị ike. 13Nʼihi nke a, ọ bụrụ na ihe oriri ga-eme ka nwanna m mee mmehie, agaghị m eri anụ ọzọ, ka m ghara ime ka nwanna m maa nʼọnya.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.