Native Bible

1 Corinthians 6:10 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

ndị niile na-ezu ohi, ndị anya ukwu, ndị na-aṅụbiga mmanya oke, ndị nkwutọ, maọbụ ndị na-apụnara mmadụ ihe ha nwere, agaghị eketa oke nʼalaeze Chineke.

1 Corinthians 6:10 in English

1 Corinthians 6:10 · Berean Standard Bible

nor thieves, nor the greedy, nor drunkards, nor verbal abusers, nor swindlers, will inherit the kingdom of God.

Context

8Ma unu onwe unu na-emejọ, ma na-aghọgbu, ọ bụladị ụmụnna unu nʼime Kraịst. 9Ọ bụ na unu amaghị na ndị na-eme ajọ omume dị otu a enweghị oke ọbụla nʼalaeze Chineke? Unu ekwela ka eduhie unu. Nʼihi na ọ dịghị onye ọbụla na-akwa iko, na ndị na-efe arụsị, ndị ikom nwere nwunye na-akwa iko, na ndị ikom na-eji ndị ikom ibe ha akwa iko, 10ndị niile na-ezu ohi, ndị anya ukwu, ndị na-aṅụbiga mmanya oke, ndị nkwutọ, maọbụ ndị na-apụnara mmadụ ihe ha nwere, agaghị eketa oke nʼalaeze Chineke. 11Na mbụ, ụfọdụ nʼime unu na-ebi ndụ dị otu a. Ma ugbu a, a sachapụla mmehie unu, doo unu nsọ nye Chineke. Ọ bụkwa site nʼaha Onyenwe anyị Jisọs Kraịst na nʼime Mmụọ nke Chineke anyị ka a gụrụ unu ka ndị ezi omume. 12Ị na-asị, “Enwere m ike ime ihe niile m maara na m kwesiri ime,” ma ọ bụghị ihe niile ga-abara m uru. “Enwere m ike ime ihe niile m maara ziri ezi,” ma a gaghị ekwe ka ihe ọbụla na-achị m.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.