Native Bible

1 Corinthians 4:8 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Ma ugbu a, ihe niile zuru unu oke. Ugbu a, unu abụrụkwala ndị ọgaranya. Unu abụrụla eze ma anyị esoghị unu. Nʼezie, ọ gaara atọ m ụtọ ma a sị na unu anọrọla nʼocheeze unu, ka anyị nwe ike soro unu bụrụ eze.

1 Corinthians 4:8 in English

1 Corinthians 4:8 · Berean Standard Bible

Already you have all you want. Already you have become rich. Without us, you have become kings. How I wish you really were kings, so that we might be kings with you!

Context

6Ugbu a ụmụnna m ejiri m onwe m na Apọlọs mara unu atụ maka ọdịmma nke unu, ka unu nwee ike isite nʼaka anyị mụta ihe site nʼihe ahụ e dere bụ nke na-asị, “Unu agafekwala ihe e dere nʼakwụkwọ nsọ.” Ka onye ọbụla nʼime unu hapụ iji otu onye nyaa isi ma leda ndị ọzọ anya. 7Onye gwara gị na ị pụrụ iche nʼetiti mmadụ ndị ọzọ? Ọ dị ihe ọbụla i nwere nke abụghị ihe ị natara anata? Ọ bụ gịnị ka i nwere nke ị na-anataghị anata? Ma ọ bụrụ na i natara ya, gịnị mere i ji anya isi dịka a ga-asị na ị nataghị ya anata? 8Ma ugbu a, ihe niile zuru unu oke. Ugbu a, unu abụrụkwala ndị ọgaranya. Unu abụrụla eze ma anyị esoghị unu. Nʼezie, ọ gaara atọ m ụtọ ma a sị na unu anọrọla nʼocheeze unu, ka anyị nwe ike soro unu bụrụ eze. 9Ọ na-adị m nnọọ ka Chineke o weere anyị bụ ndị ozi mee anyị ndị dịkarịsịrị ala, ndị a na-echeta naanị mgbe ihe niile na-agwụsị agwụsị, dịka ndị a mara ikpe ọnwụ. Nʼihi na-akpọpụtara anyị nʼihu ọha mmadụ mee anyị ihe nlere anya nye ụmụ mmadụ na ndị mmụọ ozi. 10Anyị aghọọla ndị nzuzu nʼihi Kraịst, ma unu onwe unu bụ ndị maara ihe nʼime Kraịst. Anyị bụ ndị na-adịghị ike ma unu dị ike. Anyị bụ ndị a jụrụ ajụ na ndị a na-eleda anya, ma unu bụ ndị a na-asọpụrụ.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.