Native Bible

1 Corinthians 3:7 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Onye kụrụ mkpụrụ ahụ na onye gbara mkpụrụ ahụ mmiri adịghị mkpa. Ọ bụ Chineke onye mere ka ha too dị mkpa.

1 Corinthians 3:7 in English

1 Corinthians 3:7 · Berean Standard Bible

So neither he who plants nor he who waters is anything, but only God, who makes things grow.

Context

5Onye bụ Apọlọs? Onye bụ Pọl? Ọ bụ na anyị abụghị ndị na-eje ozi, ndị wetaara unu oziọma unu kweere nʼime ya. Ọrụ dị iche iche anyị rụrụ bụkwa nke anyị rụrụ dịka Onyenwe anyị si kenye anyị ọrụ ahụ. 6Ọ bụ m kụrụ mkpụrụ ahụ, Apọlọs bụkwa onye gbara mkpụrụ ahụ mmiri, maọbụ Chineke mere ka o too. 7Onye kụrụ mkpụrụ ahụ na onye gbara mkpụrụ ahụ mmiri adịghị mkpa. Ọ bụ Chineke onye mere ka ha too dị mkpa. 8O nweghị ihe dị iche nʼetiti mụ bụ onye kụrụ mkpụrụ ahụ na Apọlọs onye gbara mkpụrụ ahụ mmiri. Ọ bụ otu ihe ahụ ka anyị bu nʼobi. Onye ọbụla ga-anata ụgwọ ọrụ ya. 9Anyị so Chineke na-arụ ọrụ. Unu onwe unu bụkwanụ ubi Chineke bụrụkwa ụlọ ya a na-ewuli elu.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.