Native Bible

1 Corinthians 3:4 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Nʼihi na mgbe otu onye na-asị, “Abụ m nke Pọl,” onye ọzọ na-asịkwa, “Abụ m nke Apọlọs,” o gosighị na unu na-akpa agwa dịka ndị bi nʼụwa?

1 Corinthians 3:4 in English

1 Corinthians 3:4 · Berean Standard Bible

For when one of you says, “I follow Paul,” and another, “I follow Apollos,” are you not mere men?

Context

2Ejighị m nri siri ike na-azụ unu, kama eji m mmiri ara na-azụ unu, nʼihi na unu apụghị iri nri dị ike. Nʼezie, ọ bụladị ugbu a, unu erubeghị iri nri siri ike. 3Nʼihi na unu na-adị ndụ dịka ndị bi nʼụwa, ebe ọ bụ na ekworo na esemokwu na-adị nʼetiti unu, nke a o zipụtaghị na unu na-eme dịka ndị ụwa, dịka ndị mmadụ efu nọ nʼụwa. 4Nʼihi na mgbe otu onye na-asị, “Abụ m nke Pọl,” onye ọzọ na-asịkwa, “Abụ m nke Apọlọs,” o gosighị na unu na-akpa agwa dịka ndị bi nʼụwa? 5Onye bụ Apọlọs? Onye bụ Pọl? Ọ bụ na anyị abụghị ndị na-eje ozi, ndị wetaara unu oziọma unu kweere nʼime ya. Ọrụ dị iche iche anyị rụrụ bụkwa nke anyị rụrụ dịka Onyenwe anyị si kenye anyị ọrụ ahụ. 6Ọ bụ m kụrụ mkpụrụ ahụ, Apọlọs bụkwa onye gbara mkpụrụ ahụ mmiri, maọbụ Chineke mere ka o too.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.