1 Ndị Kọrint 3:2
1 Corinthians 3:2 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ejighị m nri siri ike na-azụ unu, kama eji m mmiri ara na-azụ unu, nʼihi na unu apụghị iri nri dị ike. Nʼezie, ọ bụladị ugbu a, unu erubeghị iri nri siri ike.
1 Corinthians 3:2 in English
1 Corinthians 3:2 · Berean Standard Bible
I gave you milk, not solid food, for you were not yet ready for solid food. In fact, you are still not ready,
Context
1Ụmụnna m, o siiri m ike ịgwa unu okwu dịka a ga-asị na unu bụ ndị tozuru etozu nʼime Mmụọ, kama agwara m unu okwu dịka ndị anụ ahụ ha na-achị, ndị bụ ụmụntakịrị nʼime Kraịst. 2Ejighị m nri siri ike na-azụ unu, kama eji m mmiri ara na-azụ unu, nʼihi na unu apụghị iri nri dị ike. Nʼezie, ọ bụladị ugbu a, unu erubeghị iri nri siri ike. 3Nʼihi na unu na-adị ndụ dịka ndị bi nʼụwa, ebe ọ bụ na ekworo na esemokwu na-adị nʼetiti unu, nke a o zipụtaghị na unu na-eme dịka ndị ụwa, dịka ndị mmadụ efu nọ nʼụwa. 4Nʼihi na mgbe otu onye na-asị, “Abụ m nke Pọl,” onye ọzọ na-asịkwa, “Abụ m nke Apọlọs,” o gosighị na unu na-akpa agwa dịka ndị bi nʼụwa?
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.