Native Bible

1 Corinthians 3:11 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

O nweghị onye ọzọ pụrụ ịtọ ntọala karịrị ntọala ahụ e bururị ụzọ tọọ. Jisọs Kraịst bụkwa ntọala ahụ.

1 Corinthians 3:11 in English

1 Corinthians 3:11 · Berean Standard Bible

For no one can lay a foundation other than the one already laid, which is Jesus Christ.

Context

9Anyị so Chineke na-arụ ọrụ. Unu onwe unu bụkwanụ ubi Chineke bụrụkwa ụlọ ya a na-ewuli elu. 10Eji m onyinye amara Chineke nyere m tọọ ntọala ọrụ a, dịka ezi onye ọka nʼiwu ụlọ, onye ọzọ amalitela iwukwasị ụlọ nʼelu ntọala ahụ. Ma ka onye ọbụla kpachapụ anya otu o si ewu. 11O nweghị onye ọzọ pụrụ ịtọ ntọala karịrị ntọala ahụ e bururị ụzọ tọọ. Jisọs Kraịst bụkwa ntọala ahụ. 12Ma ọ bụrụ na mmadụ ọbụla na-eji ọlaedo maọbụ ọlaọcha, ma ọ bụkwanụ nkume dị oke ọnụahịa, osisi maọbụ okporo ọka, ma ọ bụkwanụ ahịhịa na-ewukwasị nʼelu ntọala ahụ, 13ọrụ onye ọbụla ga-egosipụta ihe ọ bụ, nʼihi na Ụbọchị ahụ ga-eme ka ọ pụta ìhè. A ga-eji ọkụ kpughee ya nʼihi na ọ bụ ọkụ ka a ga-eji nwapụta ụdị ọrụ ọ bụ mmadụ ọbụla rụrụ.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.