1 Ndị Kọrint 3:10
1 Corinthians 3:10 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Eji m onyinye amara Chineke nyere m tọọ ntọala ọrụ a, dịka ezi onye ọka nʼiwu ụlọ, onye ọzọ amalitela iwukwasị ụlọ nʼelu ntọala ahụ. Ma ka onye ọbụla kpachapụ anya otu o si ewu.
1 Corinthians 3:10 in English
1 Corinthians 3:10 · Berean Standard Bible
By the grace God has given me, I laid a foundation as an expert builder, and someone else is building on it. But each one must be careful how he builds.
Context
8O nweghị ihe dị iche nʼetiti mụ bụ onye kụrụ mkpụrụ ahụ na Apọlọs onye gbara mkpụrụ ahụ mmiri. Ọ bụ otu ihe ahụ ka anyị bu nʼobi. Onye ọbụla ga-anata ụgwọ ọrụ ya. 9Anyị so Chineke na-arụ ọrụ. Unu onwe unu bụkwanụ ubi Chineke bụrụkwa ụlọ ya a na-ewuli elu. 10Eji m onyinye amara Chineke nyere m tọọ ntọala ọrụ a, dịka ezi onye ọka nʼiwu ụlọ, onye ọzọ amalitela iwukwasị ụlọ nʼelu ntọala ahụ. Ma ka onye ọbụla kpachapụ anya otu o si ewu. 11O nweghị onye ọzọ pụrụ ịtọ ntọala karịrị ntọala ahụ e bururị ụzọ tọọ. Jisọs Kraịst bụkwa ntọala ahụ. 12Ma ọ bụrụ na mmadụ ọbụla na-eji ọlaedo maọbụ ọlaọcha, ma ọ bụkwanụ nkume dị oke ọnụahịa, osisi maọbụ okporo ọka, ma ọ bụkwanụ ahịhịa na-ewukwasị nʼelu ntọala ahụ,
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.